The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 22
O gbasokwara ndụmọdụ ha, mgbe o sooro Joram nwa Ehab, bụ eze Izrel, ịga buso Hazael eze Aram agha na Ramọt Gilead. Ndị Aram merụrụ Joram ahụ,
2 Chronicles 22:5 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 22Next →
He walked also after their counsel, and went with Jehoram the son of Ahab king of Israel to war against Hazael king of Syria at Ramothgilead: and the Syrians smote Joram.
Ahaziah also followed their counsel and went with Joram son of Ahab king of Israel to fight against Hazael king of Aram at Ramoth-gilead. But the Arameans wounded Joram;
He also followed their counsel, and went with Jehoram the son of Ahab king of Israel to war against Hazael king of Syria at Ramoth Gilead; and the Syrians wounded Joram.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
2 Ahazaya gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị otu afọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Atalaya nwa nwa Omri eze Izrel.
3 Ya onwe ya sokwara ụzọ niile nke ndị ezinaụlọ Ehab, nʼihi na nne ya gbara ya ume ime ajọ omume.
4 O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ezinaụlọ Ehab mere nʼihi na ha ghọrọ ndị ndụmọdụ ya mgbe nna ya nwụsịrị, nke a wetara ọdịda ya.
5 O gbasokwara ndụmọdụ ha, mgbe o sooro Joram nwa Ehab, bụ eze Izrel, ịga buso Hazael eze Aram agha na Ramọt Gilead. Ndị Aram merụrụ Joram ahụ,
6 ya mere, ọ lọghachitere na Jezril ka a gwọọ ya mmerụ ahụ ha merụrụ ya na Ramọt, nʼagha nke ya na Hazael eze Aram lụrụ. Mgbe ahụ, Ahazaya nwa Jehoram, eze Juda gara Jezril ileta Joram nwa Ehab, nʼihi na e merụrụ ya ahụ.
7 Ọ bụ site na nleta Ahazaya gara leta Joram, ka Chineke si weta ọdịda Ahazaya. Mgbe Ahazaya bịarutere, ya na Joram pụrụ ịga zute Jehu nwa Nimshi, onye ahụ Onyenwe anyị tere mmanụ ka ọ laa ezinaụlọ Ehab nʼiyi.
8 Mgbe Jehu nọ na-emezu ihe e kpebiri nʼikpe banyere ezinaụlọ Ehab, o zutere ndị ozi Juda na ụmụ ndị ikom ụmụnne Ahazaya, ndị na-ejere Ahazaya ozi, gbuo ha niile.
Read 2 Chronicles 22 in the app The whole chapter