The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 20
Jehoshafat tụrụ egwu nke ukwuu, kpebiekwa ịchọ inyeaka Onyenwe anyị. Nʼihi nke a, ọ kpọsara obubu ọnụ nye ndị Juda niile.
2 Chronicles 20:3 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 20Next →
And Jehoshaphat feared, and set himself to seek the LORD, and proclaimed a fast throughout all Judah.
Jehoshaphat was alarmed and set his face to seek the LORD. And he proclaimed a fast throughout Judah.
Jehoshaphat was alarmed, and set himself to seek the LORD. He proclaimed a fast throughout all Judah.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Mgbe oge nta gasịrị, eze ndị Moab na nke ndị Amọn, na ndị ọzọkwa, bịara ibuso Jehoshafat na ndị Juda agha.
2 Ụfọdụ ndị mmadụ bịara gwa Jehoshafat sị, “Lee, igwe usuu ndị agha na-abịa imegide gị site nʼEdọm, nakwa nʼofe osimiri Nnu (osimiri nwụrụ anwụ). Ha erutela Hazezọn Tama, ebe a na-akpọkwa En-Gedi.”
3 Jehoshafat tụrụ egwu nke ukwuu, kpebiekwa ịchọ inyeaka Onyenwe anyị. Nʼihi nke a, ọ kpọsara obubu ọnụ nye ndị Juda niile.
4 Ndị Juda zukọtara ịchọ inyeaka Onyenwe anyị; nʼezie, ha sitere nʼobodo niile nke Juda bịa ịchọ ihu Onyenwe anyị.
5 Mgbe ahụ, Jehoshafat guzoro nʼetiti nzukọ ndị Juda na Jerusalem nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼihu ogige ọhụrụ ahụ,
6 sị; “O Onyenwe anyị, Chineke nna nna anyị ha, ọ bụghị gị bụ Chineke onye bi nʼeluigwe? Ọ bụkwa gị na-achị alaeze niile nke mba dị iche iche. Ike na ume dị nʼaka gị, ọ dịkwaghị onye pụrụ iguzogide gị.
Read 2 Chronicles 20 in the app The whole chapter