The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 20
“Ugbu a lee, ndị ikom si Amọn, na Moab, na nʼugwu Sia, ndị ị na-ekweghị ka ndị Izrel banye nʼoke ala ha mgbe ha si nʼIjipt pụta, kama ha sitere nʼakụkụ ọzọ gabiga si otu a chebe ndị a ndụ.
2 Chronicles 20:10 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 20Next →
And now, behold, the children of Ammon and Moab and mount Seir, whom thou wouldest not let Israel invade, when they came out of the land of Egypt, but they turned from them, and destroyed them not;
And now, here are the men of Ammon, Moab, and Mount Seir, whom You did not let Israel invade when they came out of the land of Egypt; but Israel turned away from them and did not destroy them.
Now, behold, the children of Ammon and Moab and Mount Seir, whom you would not let Israel invade when they came out of the land of Egypt, but they turned away from them, and didn’t destroy them;
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
7 O Chineke anyị, ọ bụghị gị onwe gị chụpụrụ ndị bi nʼala, site nʼihu ndị gị Izrel, were ya nye ụmụ ụmụ Ebraham, bụ enyi gị nwoke?
8 Ha ebiela nʼime ya wukwaa ebe nsọ nʼime nye nʼAha gị na-asị,
9 ‘Ọ bụrụ na ihe ọjọọ adakwasị anyị, maọbụ mma agha, ma nke ikpe ọmụma, maọbụ ajọọ ọrịa na-efe efe, maọbụ oke ụnwụ, anyị ga-eguzo nʼihu gị nʼụlọnsọ a nke a kpọkwasịrị Aha gị, kpọkuo gị nʼime nsogbu anyị, gị onwe gị ga-aza anyị, zọpụtakwa anyị.’
10 “Ugbu a lee, ndị ikom si Amọn, na Moab, na nʼugwu Sia, ndị ị na-ekweghị ka ndị Izrel banye nʼoke ala ha mgbe ha si nʼIjipt pụta, kama ha sitere nʼakụkụ ọzọ gabiga si otu a chebe ndị a ndụ.
11 Lee ihe ha ji akwụ anyị ụgwọ bụ ịchọ ka ha chụpụ anyị nʼala a i nyere anyị ka ọ bụrụ ihe nketa anyị.
12 O Chineke anyị, ọ bụ na ị gaghị ekpe ha ikpe? Nʼihi na ike adịghị nʼime anyị iguzogide igwe mmadụ ndị a bara ụba na-abịa ịlụso anyị ọgụ. Anyị amakwaghị ihe anyị ga-eme, kama ọ bụ na gị ka anya anyị na-adịkwasị.”
13 Ndị ikom Juda niile, ha na ndị nwunye ha, na ụmụ ha, na ụmụntakịrị ha guzoro nʼihu Onyenwe anyị.
Read 2 Chronicles 20 in the app The whole chapter