The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 19

2 Chronicles 19:9

O nyere ha iwu ndị a, “Jirinụ ikwesi ntụkwasị obi, na ịtụ egwu Onyenwe anyị rụọ ọrụ unu.

2 Chronicles 19:9 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead 2 Chronicles 19Next →

2 Chronicles 19:9 in other translations

KJV King James Version

And he charged them, saying, Thus shall ye do in the fear of the LORD, faithfully, and with a perfect heart.

BSB Berean Standard Bible

He commanded them, saying, “You must serve faithfully and wholeheartedly in the fear of the LORD.

WEB World English Bible

He commanded them, saying, “You shall do this in the fear of the LORD, faithfully, and with a perfect heart.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

6 Ọ gwara ha si, “Lezienụ anya ihe unu na-eme nʼihi na ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe kama ọ bụ Onyenwe anyị, onye na-anọnyere unu mgbe unu na-ekpebi ikpe.

7 Ugbu a, kwenụ ka egwu Onyenwe anyị dịrị nʼime unu. Kpeenụ ikpe ziri ezi, nʼihi na nʼebe Onyenwe anyị Chineke anyị nọ, ikpe ikpe na-ezighị ezi, maọbụ ile mmadụ anya nʼihu maọbụ iri ngarị adịghị ya.”

8 Ọzọkwa, nʼime Jerusalem, Jehoshafat họpụtara ụfọdụ ndị Livayị, na ndị nchụaja, na ndịisi ezinaụlọ Izrel ka ha bụrụ ndị na-ahazi iwu nke Onyenwe anyị na-edozikwa esemokwu. Ha bikwa na Jerusalem.

9 O nyere ha iwu ndị a, “Jirinụ ikwesi ntụkwasị obi, na ịtụ egwu Onyenwe anyị rụọ ọrụ unu.

10 Mgbe ọbụla ụmụnna unu ndị bi nʼobodo unu dị iche iche buteere unu ikpe igbu mmadụ maọbụ ikpe mmebi iwu ọbụla, maọbụ ihe megidere ihe e nyere nʼiwu, maọbụ nke megidere ụkpụrụ, ma ọ bụkwanụ megide iwu na usoro ime ihe, unu ga-adọ ha aka na ntị ka ha ghara imehie megide Onyenwe anyị. Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe Onyenwe anyị ga-adakwasị unu na ụmụnna unu. Ma ọ bụrụ na unu arụọ ọrụ unu nke ọma, unu agaghị emehie.

11 “Amaraya, onyeisi nchụaja, ga-abụ onyeisi unu nʼihe ọbụla metụtara Onyenwe anyị. Zebadaya nwa nwoke Ishmel, onyeisi nke ebo Juda ga-abụ onyeisi unu nʼihe o bụla metụtara eze. Ndị Livayị ga-abụ ndịisi ozi nʼihu unu. Bụrụkwanụ ndị dị ike, unu atụkwala ụjọ, ka Onyenwe anyị nọnyere ndị na-eme nke ọma.”

Read 2 Chronicles 19 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV