The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 18
Maikaya zaghachiri, “Ị ga-achọpụta nke a nʼụbọchị ị ga-agbaba nʼime ime ụlọ izo onwe gị.”
2 Chronicles 18:24 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 18Next →
And Micaiah said, Behold, thou shalt see on that day when thou shalt go into an inner chamber to hide thyself.
Micaiah replied, “You will soon see, on that day when you go and hide in an inner room.”
Micaiah said, “Behold, you shall see on that day, when you go into an inner room to hide yourself.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
21 “Ọ zara, ‘Aga m apụ bụrụ mmụọ nrafu nʼọnụ ndị amụma ya niile.’ “Onyenwe anyị sịrị, ‘Ị ga-enwe ike ịrafu ya. Gaa mee otu a.’
22 “Ma ugbu a, Onyenwe anyị etinyela mmụọ okwu ụgha nʼọnụ ndị amụma gị niile ndị a. Onyenwe anyị ekwubiela nʼihe ọjọọ ga-adakwasị gị.”
23 Mgbe ahụ, Zedekaya nwa Kenaana, gara nso maa Maikaya aka na nti, jụọ ya, “Olee ụzọ ka mmụọ ahụ sitere na Onyenwe anyị gara, mgbe ọ hapụrụ m bịa ịgwa gị okwu?”
24 Maikaya zaghachiri, “Ị ga-achọpụta nke a nʼụbọchị ị ga-agbaba nʼime ime ụlọ izo onwe gị.”
25 Eze Izrel nyere iwu sị, “Jidenụ Maikaya kpụgara ya Amọn, onye na-achị obodo a, na Joash, nwa eze.
26 Ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka eze sịrị: Tinye nwoke a nʼụlọ mkpọrọ, nye ya naanị achịcha na mmiri ọṅụṅụ tutu ruo mgbe m lọghachiri nʼudo.’ ”
27 Maikaya kwupụtara sị, “Ọ bụrụ na ị lọghachi nʼudo, ọ pụtara na ọ bụghị Onyenwe anyị si nʼọnụ m kwuo okwu.” O kwukwara sị, “Unu niile, hụbakwanụ okwu m ndị a niile ama.”
Read 2 Chronicles 18 in the app The whole chapter