The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 10

2 Chronicles 10:6

Mgbe ahụ, eze Rehoboam gara ịnata ndụmọdụ nʼaka ndị okenye, bụ ndị jeere nna ya Solomọn ozi nʼoge ọ dị ndụ ya, sị ha, “Olee ndụmọdụ unu ga-enye m maka mụ inye ndị a ọsịsa?”

2 Chronicles 10:6 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead 2 Chronicles 10Next →

2 Chronicles 10:6 in other translations

KJV King James Version

And king Rehoboam took counsel with the old men that had stood before Solomon his father while he yet lived, saying, What counsel give ye me to return answer to this people?

BSB Berean Standard Bible

Then King Rehoboam consulted with the elders who had served his father Solomon during his lifetime. “How do you advise me to respond to these people?” he asked.

WEB World English Bible

King Rehoboam took counsel with the old men, who had stood before Solomon his father while he yet lived, saying, “What counsel do you give me about how to answer these people?”

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

3 Ya mere, ha ziri ozi kpọọ Jeroboam, ya na ndị Izrel niile jekwuru Rehoboam sị ya:

4 “Nna gị boro anyị ibu arọ, ma ugbu a mee ka ibu arọ na ịyagba arọ a nke o bokwasịrị anyị dị mfe, anyị ga-ejere gị ozi.”

5 Rehoboam zara ha sị, “Bịaghachikwutenụ m mgbe ụbọchị atọ gasịrị.” Nʼihi ya ndị ahụ lara.

6 Mgbe ahụ, eze Rehoboam gara ịnata ndụmọdụ nʼaka ndị okenye, bụ ndị jeere nna ya Solomọn ozi nʼoge ọ dị ndụ ya, sị ha, “Olee ndụmọdụ unu ga-enye m maka mụ inye ndị a ọsịsa?”

7 Ha zara ya, “Ọ bụrụ na ị ga-emere ha ihe ọma, mee ihe ga-atọ ha ụtọ, nyekwa ha ọsịsa dị mma, ha ga-anọgide bụrụ ndị ohu gị mgbe niile.”

8 Ma ọ nabataghị ndụmọdụ ndị okenye nyere ya, ọ gakwuru ụmụ okorobịa ndị ya na ha tokọrọ, bụkwa ndị na-ejere ya ozi, ka ha nye ya ndụmọdụ.

9 Rehoboam jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ndụmọdụ unu? Gịnị bụ ọsịsa anyị ga-enye ndị a na-asị, ‘Mee ka ibu arọ nna gị bokwasịrị anyị dị mfe’? ”

Read 2 Chronicles 10 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV