The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 10

2 Chronicles 10:13

Eze sara ha okwu nʼolu dị ike. Ọ jụrụ ndụmọdụ ndị okenye

2 Chronicles 10:13 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead 2 Chronicles 10Next →

2 Chronicles 10:13 in other translations

KJV King James Version

And the king answered them roughly; and king Rehoboam forsook the counsel of the old men,

BSB Berean Standard Bible

And the king answered them harshly. King Rehoboam rejected the advice of the elders

WEB World English Bible

The king answered them roughly; and King Rehoboam abandoned the counsel of the old men,

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

10 Ụmụ okorobịa ahụ, bụ ndị ya na ha tokọrọ, zaghachiri sị, “Gwa ndị ahụ sịrị gị, ‘Nna gị bokwasịrị anyị ibu arọ, ma mee ka ibu anyị dị mfe,’ ị ga-agwa ha, sị, ‘Mkpịsịaka nta dị nʼaka m gbara okpotokpo karịa ukwu nna m.

11 Nna m boro unu ibu arọ; aga m atụkwasị ihe nʼibu ahụ mee ka ọ dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, maọbụ akpị ka m ga-eji mekpaa unu ahụ.’ ”

12 Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Jeroboam na ndị Izrel niile bịaghachiri ịnụrụ ọsịsa Rehoboam, dịka eze kwuru, sị, “Laghachitenụ nʼụbọchị nke atọ.”

13 Eze sara ha okwu nʼolu dị ike. Ọ jụrụ ndụmọdụ ndị okenye

14 ma gbasoro ndụmọdụ nke ụmụ okorobịa nyere, ọ sịrị, “Nna m mere ka ibu unu dị arọ, aga m eme ka ibu unu dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, aga m eji akpị mekpaa unu ahụ.”

15 Ya mere, eze aṅaghị ndị ahụ ntị, nʼihi mgbanwe nke ọnọdụ niile a sitere nʼebe Chineke nọ, ka e mezuo okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Jeroboam nwa Nebat site nʼọnụ Ahija onye Shilo.

16 Mgbe Izrel niile hụrụ na eze jụrụ ige ha ntị, ha zaghachiri ya sị, “Olee oke anyị nwere nʼime Devid? Olee ihe nketa anyị nwere nʼime nwa Jesi? Ndị Izrel, laanụ nʼụlọ ikwu unu! Gị Devid lekọtakwa ụlọ nke gị.” Nke a mere, ka ndị Izrel niile laa nʼụlọ ha.

Read 2 Chronicles 10 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV