The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 1 Samuel 4

1 Samuel 4:13

Mgbe o rutere, Elayị nọ nʼoche ya nʼakụkụ ụzọ, na-eche, nʼihi na obi ya na-ama jijiji, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Mgbe nwoke ahụ batara nʼime obodo, kọọ ihe mere, mkpu akwa dara nʼobodo ahụ niile.

1 Samuel 4:13 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead 1 Samuel 4Next →

1 Samuel 4:13 in other translations

KJV King James Version

And when he came, lo, Eli sat upon a seat by the wayside watching: for his heart trembled for the ark of God. And when the man came into the city, and told it, all the city cried out.

BSB Berean Standard Bible

When he arrived, there was Eli, sitting on his chair beside the road and watching, because his heart trembled for the ark of God. When the man entered the city to give a report, the whole city cried out.

WEB World English Bible

When he came, behold, Eli was sitting on his seat by the road watching, for his heart trembled for God’s ark. When the man came into the city and told about it, all the city cried out.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

10 Ndị Filistia lụrụ ọgụ dịka dike, lụgbuo ndị Izrel. Ndị agha ji ụkwụ eje ọgụ ọnụọgụgụ ha dị iri puku atọ nwụrụ nʼotu ụbọchị ahụ. Ma ndị fọdụrụ gbalara nʼụlọ ikwu ha.

11 Ndị Filistia dọtara igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼagha, ma gbukwaa Hofni na Finehaz ụmụ Elayị.

12 Ma otu nwoke onye Benjamin gbapụrụ ọsọ site nʼọgbọ agha ahụ, gbara ruo Shaịlo nʼotu ụbọchị ahụ, o yi uwe dọwara adọwa, aja dịkwa ya nʼisi.

13 Mgbe o rutere, Elayị nọ nʼoche ya nʼakụkụ ụzọ, na-eche, nʼihi na obi ya na-ama jijiji, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Mgbe nwoke ahụ batara nʼime obodo, kọọ ihe mere, mkpu akwa dara nʼobodo ahụ niile.

14 Elayị nụrụ iti mkpu ahụ jụọ sị, “Gịnị bụ isi ụzụ a?” Onyeozi ahụ mere ngwangwa bata gwa Elayị okwu.

15 Elayị agbaala iri afọ itoolu na afọ asatọ nʼoge a, nke mere na ọ naghị ahụkwa ụzọ.

16 Nwoke ahụ gwara Elayị sị, “Esi m nʼihu agha gbalata. Anọ m nʼebe ahụ taa hụ ka agha si gaa.” Elayị jụrụ sị, “Nwa m, ọ bụ gịnị mere?”

Read 1 Samuel 4 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV