The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 1 Samuel 13
Ya mere, ụmụ Izrel niile nụrụ akụkọ ahụ nke kwuru sị, “Sọl ebusola ọmụma ụlọ ikwu ndị agha Filistia agha, nʼihi nke a, ndị Izrel niile abụrụla ndị a kpọrọ asị ugbu a nʼetiti ndị Filistia.” Ya mere, ndị agha Izrel niile pụtakwara soro Sọl gaa Gilgal.
1 Samuel 13:4 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 1 Samuel 13Next →
And all Israel heard say that Saul had smitten a garrison of the Philistines, and that Israel also was had in abomination with the Philistines. And the people were called together after Saul to Gilgal.
And all Israel heard the news: “Saul has attacked an outpost of the Philistines, and now Israel has become a stench to the Philistines!” Then the people were summoned to join Saul at Gilgal.
All Israel heard that Saul had struck the garrison of the Philistines, and also that Israel was considered an abomination to the Philistines. The people were gathered together after Saul to Gilgal.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Sọl gbara iri afọ atọ mgbe e mere ya eze. Ọ chịkwara dịka eze nʼala Izrel iri afọ anọ na abụọ.
2 Sọl sitere nʼetiti ụmụ Izrel họpụta puku ndị ikom atọ ka ha bụrụ ndị agha ya. Sọl na puku abụọ nọ na Mikmash nʼala ugwu ugwu Betel. Otu puku nọnyeere Jonatan na Gibea, nʼala Benjamin. Ndị ikom ndị fọdụrụ ka o zighachiri, onye ọbụla nʼụlọ ha.
3 Ma Jonatan busoro ndị agha Filistia nọ na Geba agha. Ndị Filistia nụkwara ihe banyere ya. Mgbe ahụ, Sọl nyere iwu ka e gbuo opi ike nʼala Izrel niile, kwuo sị, “Unu ndị Hibru niile, geenụ ntị.”
4 Ya mere, ụmụ Izrel niile nụrụ akụkọ ahụ nke kwuru sị, “Sọl ebusola ọmụma ụlọ ikwu ndị agha Filistia agha, nʼihi nke a, ndị Izrel niile abụrụla ndị a kpọrọ asị ugbu a nʼetiti ndị Filistia.” Ya mere, ndị agha Izrel niile pụtakwara soro Sọl gaa Gilgal.
5 Ndị Filistia nʼonwe ha chịkọtara ndị agha ha ibuso ndị Izrel agha. Ọnụọgụgụ ụgbọ agha ha dị puku atọ, ndị na-agba ịnyịnya ha nwere dị puku isii; ndị agha ha ndị ọzọ dị ukwu nʼọnụọgụgụ. Nʼezie, ha dị ukwuu dịka aja dị nʼọnụ osimiri. Ha manyere ụlọ ikwu ha na Mikmash nʼọwụwa anyanwụ Bet-Aven.
6 Mgbe ndị agha Izrel hụrụ na ọnọdụ ha dị njọ nke ukwuu, hụkwa na ndị iro na-emegide ha, ha zoro onwe ha nʼọgba nkume, nʼime oke ọhịa, nʼetiti nkume, nʼime olulu na nʼime oghere ọbụla.
7 Ndị Hibru ụfọdụ gafere Jọdan ruo nʼala Gad na Gilead. Nʼoge a, Sọl nọ na Gilgal, ndị agha niile ya na ha nọ na-amakwa jijiji nʼihi ụjọ.
Read 1 Samuel 13 in the app The whole chapter