The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 1 Kings 21
Mgbe ahụ, Ehab jụrụ Ịlaịja ajụjụ sị ya, “Onye iro m, ị chọrọkwala m bịa?” Ịlaịja zara sị ya, “E, achọrọla m gị bịa nʼihi nnyefe i nyefere onwe gị ime ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị.
1 Kings 21:20 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 1 Kings 21Next →
And Ahab said to Elijah, Hast thou found me, O mine enemy? And he answered, I have found thee: because thou hast sold thyself to work evil in the sight of the LORD.
When Elijah arrived, Ahab said to him, “So you have found me out, my enemy.” He replied, “I have found you out because you have sold yourself to do evil in the sight of the LORD.
Ahab said to Elijah, “Have you found me, my enemy?” He answered, “I have found you, because you have sold yourself to do that which is evil in the LORD’s sight.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
17 Ma okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja, onye Tishbe, sị ya,
18 “Bilie, gaa zute Ehab, eze Izrel onye bi na Sameria. Ọ nọ ugbu a nʼime ubi vaịnị Nebọt inwetara ya onwe ya.
19 Gwa ya sị ya, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: I gbuola ọchụ mmadụ si otu a nwetara onwe gị ihe nketa? Ebe ahụ nkịta nọ rachaa ọbara Nebọt ka ha ga-anọ rachaakwa ọbara gị. E, ọbara gị onwe gị.’ ”
20 Mgbe ahụ, Ehab jụrụ Ịlaịja ajụjụ sị ya, “Onye iro m, ị chọrọkwala m bịa?” Ịlaịja zara sị ya, “E, achọrọla m gị bịa nʼihi nnyefe i nyefere onwe gị ime ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị.
21 Ọ sịrị, ‘Aga m eme ka ihe ọjọọ dakwasị gị. Aga m ekpochapụ ndị agbụrụ gị, site nʼezinaụlọ Ehab bipụ nwoke ọbụla, maọbụ ohu maọbụ onyenwe onwe ya nʼIzrel.
22 Aga m eme ka ụlọ gị dịrị ka nke Jeroboam nwa Nebat, na dịka nke Baasha nwa Ahija, nʼihi na ị kpasuola m iwe, meekwa ka Izrel mehie.’
23 “Ma banyere Jezebel, Onyenwe anyị sịrị, ‘Ụmụ nkịta ga-eri anụ ahụ Jezebel nʼakụkụ mgbidi aja ụlọ dị nʼobodo Jezril.’
Read 1 Kings 21 in the app The whole chapter