The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 1 John 2
Ma unu onwe unu, otite mmanụ ahụ unu natara nʼaka ya na-anọgide nʼime unu, nʼihi nke a, onye ozizi ọzọ adịghị unu mkpa. Dịka otite mmanụ ya na-ezi unu ihe banyere ihe niile, bụrụkwa eziokwu, ọ bụghị okwu ụgha. Ya mere, dịka o zikwara unu, na-anọgidenụ nʼime ya.
1 John 2:27 · Baịbụlụ Nsọ
But the anointing which ye have received of him abideth in you, and ye need not that any man teach you: but as the same anointing teacheth you of all things, and is truth, and is no lie, and even as it hath taught you, ye shall abide in him.
And as for you, the anointing you received from Him remains in you, and you do not need anyone to teach you. But just as His true and genuine anointing teaches you about all things, so remain in Him as you have been taught.
As for you, the anointing which you received from him remains in you, and you don’t need for anyone to teach you. But as his anointing teaches you concerning all things, and is true, and is no lie, and even as it taught you, you will remain in him.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
24 Hụnụ na ihe unu nụrụ site na mmalite na-anọgide nʼime unu. Ọ bụrụ na ihe unu nụrụ na mbido ebiri nʼime unu, unu ga-anọgide nʼime Ọkpara ahụ na nʼime Nna ahụ.
25 Ihe o kwere anyị na nkwa bụ nke a, ndụ ebighị ebi.
26 Ana m edere unu ihe ndị a banyere ndị ahụ na-agbalị iduhie unu.
27 Ma unu onwe unu, otite mmanụ ahụ unu natara nʼaka ya na-anọgide nʼime unu, nʼihi nke a, onye ozizi ọzọ adịghị unu mkpa. Dịka otite mmanụ ya na-ezi unu ihe banyere ihe niile, bụrụkwa eziokwu, ọ bụghị okwu ụgha. Ya mere, dịka o zikwara unu, na-anọgidenụ nʼime ya.
28 Ugbu a ụmụntakịrị m, nọgidesienụ ike nʼime ya, ka ọ ga-abụ mgbe e mere ka ọ pụta ìhè, anyị ga-abụ ndị obi siri ike, ndị ihere na-agaghị eme, nʼihu ya mgbe ọ bịara.
29 Ọ bụrụ na unu matara na ọ bụ onye ezi omume, unu maara na onye ọbụla nke na-eme ihe ziri ezi bụ onye a mụrụ site na ya.
Read 1 John 2 in the app The whole chapter