The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 1 Chronicles 9
Ndị si nʼebo Juda, na Benjamin, na Ifrem na Manase lọta bịa biri na Jerusalem bụ ndị a:
1 Chronicles 9:3 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 1 Chronicles 9Next →
And in Jerusalem dwelt of the children of Judah, and of the children of Benjamin, and of the children of Ephraim, and Manasseh;
These were some of the descendants of Judah, Benjamin, Ephraim, and Manasseh who lived in Jerusalem:
In Jerusalem, there lived of the children of Judah, of the children of Benjamin, and of the children of Ephraim and Manasseh:
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 E dere usoro ọmụmụ ụmụ Izrel niile nʼime akwụkwọ ndị eze Izrel na Juda. Emesịa, a dọọrọ ha nʼagha buru ha gaa Babilọn nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha.
2 Nʼime ndị a, ndị bụ ụzọ lọta bịa birikwa nʼihe onwunwe ha nʼobodo nke aka ha bụ ụfọdụ ndị Izrel, na ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ ukwu.
3 Ndị si nʼebo Juda, na Benjamin, na Ifrem na Manase lọta bịa biri na Jerusalem bụ ndị a:
4 Utai nwa Amihud, nwa Omri, nwa Imri, nwa Bani, onye ikwu Perez, nwa Juda.
5 Nʼezinaụlọ Shilo: Asaya nwa mbụ ya na ụmụ ya ndị ikom.
6 Ụmụ Zera, Jeuel so nʼime ha. Ọnụọgụgụ ndị Juda niile lọtara dị narị isii na iri itoolu (690).
Read 1 Chronicles 9 in the app The whole chapter