The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 1 Chronicles 5
Ha ji ike chịkọrọ anụ ụlọ ndị Haga, dị iri puku ịnyịnya kamel ise, narị puku atụrụ abụọ na iri puku ise, puku ịnyịnya ibu abụọ. Ha dọkpụkwara narị puku ndị mmadụ nʼagha.
1 Chronicles 5:21 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 1 Chronicles 5Next →
And they took away their cattle; of their camels fifty thousand, and of sheep two hundred and fifty thousand, and of asses two thousand, and of men an hundred thousand.
They seized the livestock of the Hagrites—50,000 camels, 250,000 sheep, and 2,000 donkeys. They also took 100,000 captives,
They took away their livestock: of their camels fifty thousand, and of sheep two hundred fifty thousand, and of donkeys two thousand, and of men one hundred thousand.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
18 Ndị Ruben na ndị Gad, na ọkara ebo Manase nwere iri puku mmadụ anọ na anọ na narị asaa na iri isii (44,760) ndị jikeere ije agha, ndị dị ike, ndị a zụrụ iji ọta na mma agha, na ụta ibu agha.
19 Ha busoro ndị Haga, na Jetua, na Nafish na ndị Nodab agha.
20 E nyeere ha aka ibuso ha agha, Chineke nyefere ndị Haga na ndị niile na-enyere ha aka nʼaka ha, nʼihi na ha kpọkuru ya nʼoge ọgụ ahụ. Ọ zara ekpere ha nʼihi na ha tụkwasịrị ya obi.
21 Ha ji ike chịkọrọ anụ ụlọ ndị Haga, dị iri puku ịnyịnya kamel ise, narị puku atụrụ abụọ na iri puku ise, puku ịnyịnya ibu abụọ. Ha dọkpụkwara narị puku ndị mmadụ nʼagha.
22 E gbukwara ọtụtụ ndị mmadụ nʼihi na agha ahụ bụ nke Chineke lụrụ nʼonwe ya. Ha bichiri ala ahụ tutu ruo mgbe a dọọrọ Izrel niile nʼagha.
23 Ọkara ebo Manase dị ukwuu nʼọnụọgụgụ; ha nwere ebe obibi ha site nʼala Bashan ruo Baal-Hemon, ya bụ, ruo Senia, ugwu Hemon.
24 Ndịisi ikwu ha niile bụ ndị a: Efaa, Ishi, Eliel, Azriel, Jeremaya, Hodavaya na Jadiel. Ndị a niile bụ dimkpa nʼagha, ndị a ma ama na ndịisi ezinaụlọ.
Read 1 Chronicles 5 in the app The whole chapter