The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 1 Chronicles 4
Ndị ikom ndị a e depụtara aha ha bụ ndị ndu ikwu ha. Ezinaụlọ ha mụbara nke ukwuu,
1 Chronicles 4:38 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 1 Chronicles 4Next →
These mentioned by their names were princes in their families: and the house of their fathers increased greatly.
These men listed by name were the leaders of their clans. Their families increased greatly,
these mentioned by name were princes in their families. Their fathers’ houses increased greatly.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
35 Juel, Jehu nwa Joshibaya, nwa Seraya, nwa Asiel,
36 nakwa Elioenai, Jaakoba, Jeshohaya, Asaya, Adiel, Jesimiel na Benaya,
37 na Ziza nwa Shifi, nwa Alon, nwa Jedaya, nwa Shimri, nwa Shemaya.
38 Ndị ikom ndị a e depụtara aha ha bụ ndị ndu ikwu ha. Ezinaụlọ ha mụbara nke ukwuu,
39 ha gakwara na mpụta Gedoa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ndagwurugwu ịchọrọ igwe anụ ụlọ ha ebe ịta nri.
40 Ha chọtara ebe ịta ahịhịa anụ ụlọ mara mma, nke sara mbara, nke dị jụụ, bụrụkwa ebe nsogbu na-adịghị. Ụfọdụ nʼime ụmụ Ham ebiela nʼebe ahụ na mbụ.
41 Ndị ikom ndị a e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ bịara nʼoge Hezekaya na-achị dịka eze Juda. Ha busoro ụmụ Ham agha nʼebe obibi ha, busokwa ndị Meunim bi nʼebe ahụ agha, bibie ha kpamkpam, dịka ọ dị ruo taa. Emesịa ha bichiri ebe ahụ nʼihi na ebe ịta ahịhịa nke igwe anụ ụlọ ha nʼebe ahụ.
Read 1 Chronicles 4 in the app The whole chapter