The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 1 Chronicles 17

1 Chronicles 17:21

Olee ndị dịka ndị gị, bụ Izrel, bụ otu mba nʼelu ụwa ndị Chineke ha gara ịgbapụtara onwe ya ka ọ bụrụ otu ndị, na iji mere onwe gị aha, rụọkwa ọrụ ịtụnanya dị egwu dịkwa ukwuu nʼihi ha, site nʼịchụpụ mba dị iche iche na chi niile ha site nʼihu ndị gị, bụ ndị ị gbapụtara site nʼIjipt?

1 Chronicles 17:21 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead 1 Chronicles 17Next →

1 Chronicles 17:21 in other translations

KJV King James Version

And what one nation in the earth is like thy people Israel, whom God went to redeem to be his own people, to make thee a name of greatness and terribleness, by driving out nations from before thy people, whom thou hast redeemed out of Egypt?

BSB Berean Standard Bible

And who is like Your people Israel—the one nation on earth whom God went out to redeem as a people for Himself? You made a name for Yourself through great and awesome wonders by driving out nations from before Your people, whom You redeemed from Egypt.

WEB World English Bible

What one nation in the earth is like your people Israel, whom God went to redeem to himself for a people, to make you a name by great and awesome things, in driving out nations from before your people whom you redeemed out of Egypt?

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

18 “Gịnị ọzọ ka Devid ga-agwa gị, nʼihi nsọpụrụ i nyere ohu gị? Nʼihi na ị maara ohu gị nke ọma,

19 O Onyenwe anyị, nʼihi okwu gị na dịka ọchịchọ obi gị si dị, i meela ihe a dị ukwuu, meekwa ka ọ mata nkwa ndị a niile dị ukwuu.

20 “Onyenwe anyị, ọ dịghị onye dịka gị, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị gị, dịka anyị nụrụ ya na ntị anyị.

21 Olee ndị dịka ndị gị, bụ Izrel, bụ otu mba nʼelu ụwa ndị Chineke ha gara ịgbapụtara onwe ya ka ọ bụrụ otu ndị, na iji mere onwe gị aha, rụọkwa ọrụ ịtụnanya dị egwu dịkwa ukwuu nʼihi ha, site nʼịchụpụ mba dị iche iche na chi niile ha site nʼihu ndị gị, bụ ndị ị gbapụtara site nʼIjipt?

22 I mere ka ndị gị Izrel bụrụ ndị nke gị ruo mgbe ebighị ebi. Gị onwe gị kwa, Onyenwe anyị, abụrụla Chineke ha.

23 “Ma ugbu a, Onyenwe anyị, mee ka nkwa a nke i kwere banyere ohu gị na ụlọ ya bụrụ nke ga-eguzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. Mezukwaa ihe niile dịka nkwa gị si dị,

24 ka o nwee ike guzosie ike. Ka aha gị bụrụ ihe dị ukwuu ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ ndị mmadụ ga-asị, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke na-achị Izrel, bụ Chineke Izrel.’ A ga-emekwa ka ụlọ ohu gị Devid guzosie ike nʼihu gị.

Read 1 Chronicles 17 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV