The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 1 Chronicles 16
Devid nyefekwara Zadọk, onye nchụaja, na ndị nchụaja ibe ya, ọrụ ịnọ nʼihu ụlọ nzute Onyenwe anyị, nʼebe dị elu nke Gibiọn.
1 Chronicles 16:39 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 1 Chronicles 16Next →
And Zadok the priest, and his brethren the priests, before the tabernacle of the LORD in the high place that was at Gibeon,
And David left Zadok the priest and his fellow priests before the tabernacle of the LORD at the high place in Gibeon
and Zadok the priest and his brothers the priests, before the LORD’s tabernacle in the high place that was at Gibeon,
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
36 Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Mgbe ahụ, mmadụ niile sịrị, “Amen” na “Toonu Onyenwe anyị.”
37 Devid hapụrụ Asaf na ndị Livayị ibe ya nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ ụbọchị niile ije ozi mgbe niile, dịka ọrụ ụbọchị ọbụla si dị.
38 Obed-Edọm nwa Jedutun so nʼime ha, ya na Hosa, na iri mmadụ isii na asatọ ọzọ. Obed-Edọm nwa Jedutun na Hosa bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ.
39 Devid nyefekwara Zadọk, onye nchụaja, na ndị nchụaja ibe ya, ọrụ ịnọ nʼihu ụlọ nzute Onyenwe anyị, nʼebe dị elu nke Gibiọn.
40 Nʼihi ịchụ aja nsure ọkụ mgbe niile nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ụtụtụ na anyasị niile nʼusoro dịka e si dee ya nʼakwụkwọ iwu Onyenwe anyị, nke o nyere ndị Izrel.
41 Devid họpụtakwara Heman, na Jedutun, na ndị ọzọ a kpọrọ aha họpụta inye Onyenwe anyị ekele, “nʼihi ịhụnanya ya na obi ebere ya nke na-adị ruo mgbe ebighị ebi.”
42 Heman na Jedutun bụ ndị ọ dịịrị ịfụ opi, na ịkụ ogene ọla, na ihe egwu ndị ọzọ eji na-enye Chineke otuto. Ụmụ ndị ikom Jedutun bụ ndị nọ nche nʼọnụ ụzọ ama.
Read 1 Chronicles 16 in the app The whole chapter