The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 1 Chronicles 13
Devid tụrụ egwu Chineke nʼụbọchị ahụ, o kwuru sị, “M ga-esi aṅaa bubatara onwe m igbe ọgbụgba ndụ a?”
1 Chronicles 13:12 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 1 Chronicles 13Next →
And David was afraid of God that day, saying, How shall I bring the ark of God home to me?
That day David feared God and asked, “How can I ever bring the ark of God to me?”
David was afraid of God that day, saying, “How can I bring God’s ark home to me?”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
9 Mgbe ha rutere nʼebe ịzọcha ọka nke Kidon, Ụza setịpụrụ aka ya ijide igbe ọgbụgba ndụ ahụ, nʼihi na ehi ahụ zọhiere ụkwụ.
10 Ma iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide Ụza, o tigburu ya nʼihi na o metụrụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ aka. Ya mere, ọ nwụrụ nʼebe ahụ nʼihu Chineke.
11 Mgbe ahụ, iwe were Devid nʼihi ọnụma Onyenwe anyị dakwasịrị Ụza, ruo taa, a na-akpọ ebe ahụ Perez Ụza.
12 Devid tụrụ egwu Chineke nʼụbọchị ahụ, o kwuru sị, “M ga-esi aṅaa bubatara onwe m igbe ọgbụgba ndụ a?”
13 O bubataghị igbe ọgbụgba ndụ ahụ nʼime obodo Devid, kama o bugara ya nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git.
14 Igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ nọrọ nʼezinaụlọ Obed-Edọm nʼụlọ ya ọnwa atọ. Onyenwe anyị gọzikwara ezinaụlọ ya na ihe niile o nwere.
Read 1 Chronicles 13 in the app The whole chapter